Native Bible

Ezekiel 22:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Achọrọ m otu onye nʼetiti ha bụ onye nke ga-ewuzi mgbidi ogige, guzokwa nʼihu m ikwuchite ọnụ ala a, ka m ghara ịla ala a nʼiyi, ma ọ dịghị onye m hụrụ.

Ezekiel 22:30 in English

Ezekiel 22:30 · Berean Standard Bible

I searched for a man among them to repair the wall and stand in the gap before Me on behalf of the land, so that I should not destroy it. But I found no one.

Context

28Ndị amụma ha eteela nzu nʼọrụ ha niile site nʼọhụ ụgha nʼịgba afa ụgha mgbe ha na-ahụghị ọhụ ọbụla. Ha na-asị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị,’ mgbe Onyenwe anyị na-ekwughị ihe ọbụla. 29Ndị ala a na-eji aka ike na-apụnara ndị ọzọ ihe ha nwere na-ezukwa ohi. Ha na-emegbu ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa, na-emegbukwa ndị ọbịa site nʼụzọ ekpeghị ikpe ziri ezi. 30“Achọrọ m otu onye nʼetiti ha bụ onye nke ga-ewuzi mgbidi ogige, guzokwa nʼihu m ikwuchite ọnụ ala a, ka m ghara ịla ala a nʼiyi, ma ọ dịghị onye m hụrụ. 31Nʼihi ya, aga m awụkwasị ha ọnụma m, jirikwa iwe m dị ọkụ rechapụ ha. Aga m ebokwasịkwa ahụhụ niile nke mmehie ha, nʼisi ha, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.” 22:25 Ụmụ eze nʼebe pụtara ndị amụma

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.