Izikiel 20:9
Ezekiel 20:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma nʼihi aha m, e si m Ijipt kpọpụta ha. E mere m nke a ka a ghara imerụ aha m bụ nke dị nsọ, nʼanya ndị mba dị iche iche nʼetiti ndị ha binyere, bụ ndị mkpughere onwe m nye Izrel nʼihu ha.
Ezekiel 20:9 in English
Ezekiel 20:9 · Berean Standard Bible
But I acted for the sake of My name, that it should not be profaned in the eyes of the nations among whom they were living, in whose sight I had revealed Myself to Israel by bringing them out of the land of Egypt.
Context
7Mgbe ahụ, agwara m ha, “Onye ọbụla nʼime unu, wezuganụ oyiyi ihe arụ niile ndị ahụ bụ nke unu legidere anya, unu ejikwala arụsị niile nke Ijipt merụọ onwe unu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu.” 8“ ‘Ma ha nupuru isi megide m. Ha aṅaghị m ntị. Ha ewezugakwaghị oyiyi ihe arụ ndị a, bụ nke ha lekwasịrị anya, maọbụ hapụkwanụ arụsị niile nke ndị Ijipt. Nʼihi ya, aga m awụkwasị ha oke iwe m, meekwa ka iwe m zuo oke nʼahụ ha nʼIjipt. 9Ma nʼihi aha m, e si m Ijipt kpọpụta ha. E mere m nke a ka a ghara imerụ aha m bụ nke dị nsọ, nʼanya ndị mba dị iche iche nʼetiti ndị ha binyere, bụ ndị mkpughere onwe m nye Izrel nʼihu ha. 10Nʼihi ya, esitere m nʼIjipt dupụta ha, dubata ha nʼọzara. 11Nʼebe ahụ ka m nọ nye ha iwu m niile, gosikwa ha ụkpụrụ m, gwa ha na onye ọbụla debere ha ga-adị ndụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.