Izikiel 20:34
Ezekiel 20:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m akpọpụta unu site na mba dị iche iche, chịkọtaa unu site na mba ndị ahụ a chụsasịrị unu. Ọ bụ aka m dị ike, aka m setịpụrụ na ọnụma a wụpụrụ ka m ga-eji mee ya.
Ezekiel 20:34 in English
Ezekiel 20:34 · Berean Standard Bible
With a strong hand, an outstretched arm, and outpoured wrath I will bring you out from the peoples and gather you * from the lands to which you have been scattered.
Context
32“ ‘Unu na-ekwu nʼobi unu sị, “Anyị chọrọ ịdị ka mba ndị ọzọ, dịka agbụrụ ndị ọzọ nọ nʼụwa, ndị na-akpọ isiala nye osisi na nkume.” Ma ihe unu bu nʼobi agaghị emezu. 33Dịka m na-adị ndụ, aga m eji aka ike na ogwe aka e setịrị eseti nakwa nwụpụ nke oke iwe m chịa unu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya. 34Aga m akpọpụta unu site na mba dị iche iche, chịkọtaa unu site na mba ndị ahụ a chụsasịrị unu. Ọ bụ aka m dị ike, aka m setịpụrụ na ọnụma a wụpụrụ ka m ga-eji mee ya. 35Aga m akpọbata unu nʼọzara nke mba niile, nọdụ nʼebe ahụ kpee unu ikpe nʼihu nʼihu. 36Dịka m kpere nna nna unu ha ikpe nʼọzara nke dị nʼala Ijipt, otu a ka m ga-esi kpee unu ikpe, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.