Native Bible

Ezekiel 20:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

E jikwa m iweli aka elu ṅụọrọ ha iyi nʼime ọzara, na m ga-achụsasị ha nʼetiti mba niile, mee ka ha gbasaa nʼakụkụ niile nke ụwa,

Ezekiel 20:23 in English

Ezekiel 20:23 · Berean Standard Bible

However, with an uplifted hand I swore to them in the wilderness that I would scatter them among the nations and disperse them throughout the lands.

Context

21“ ‘Ma ụmụ ahụ nupuru isi megide m. Ha ejegharịghị nʼụkpụrụ m, ha elezighị anya ka ha debe iwu nke m kwuru banyere ha, “Na onye ọbụla na-erubere ha isi ga-adị ndụ site na ha,” ha merụrụ ụbọchị izuike m. Nʼihi ya, asịrị m, Aga m awụkwasị ha ọnụma m, mezuokwa iwe m megide ha nʼọzara. 22Ọzọkwa, eseghachiri m aka m, nʼihi aha m, e mere m ihe ga-eme ka a ghara ime ya ka ọ hapụ ịdị nsọ nʼanya ndị mba niile, bụ ndị hụrụ mgbe m si Ijipt kpọpụta ha 23E jikwa m iweli aka elu ṅụọrọ ha iyi nʼime ọzara, na m ga-achụsasị ha nʼetiti mba niile, mee ka ha gbasaa nʼakụkụ niile nke ụwa, 24nʼihi na ha edebeghị iwu m, kama ha jụrụ ụkpụrụ niile, lelịa ma merụọkwa ụbọchị izuike m. Naanị ihe na-agụ ha bụ arụsị niile nke nna ha. 25Ahapụrụ m ha ka ha nabatara onwe ha iwu na omenaala dị iche iche nke na-abaghị uru. Nʼihi na site nʼidebe omenaala ndị a, ha apụghị inweta ndụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.