Native Bible

Ezekiel 20:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mụ onwe m bụ Onyenwe na Chineke gị. Gbasoonụ iwu m niile, lezie anya ka ị sorokwa ụzọ m niile.

Ezekiel 20:19 in English

Ezekiel 20:19 · Berean Standard Bible

I am the LORD your God; walk in My statutes, keep My ordinances, and practice them.

Context

17Ma eji m obi ebere lee ha anya ma ghara ịla ha nʼiyi. Ekpochapụghị m ha nʼọzara. 18Mgbe ahụ, agwara m ụmụ ha okwu nʼọzara, “Unu agbasola nzọ ụkwụ nna unu ha maọbụ debe iwu ha maọbụ jiri arụsị ha merụọ onwe unu. 19Mụ onwe m bụ Onyenwe na Chineke gị. Gbasoonụ iwu m niile, lezie anya ka ị sorokwa ụzọ m niile. 20Doonụ ụbọchị izuike m nsọ, ka ha ghọọkwa ihe ịrịbama nʼetiti mụ na unu. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe na Chineke unu.” 21“ ‘Ma ụmụ ahụ nupuru isi megide m. Ha ejegharịghị nʼụkpụrụ m, ha elezighị anya ka ha debe iwu nke m kwuru banyere ha, “Na onye ọbụla na-erubere ha isi ga-adị ndụ site na ha,” ha merụrụ ụbọchị izuike m. Nʼihi ya, asịrị m, Aga m awụkwasị ha ọnụma m, mezuokwa iwe m megide ha nʼọzara.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.