Native Bible

Ezekiel 20:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Ma ụlọ nke Izrel nupuru isi megide m. Nʼime ọzara ahụ, ha jụrụ idebe iwu m. Ha agbasoghị usoro m, ọ bụ ezie na ịgbaso ya pụtara ịdị ndụ. Ha edebeghị ụbọchị izuike m nsọ. Nʼihi ya, ekpebikwara m na m ga-awụkwasị ha iwe ọkụ m, ka m kpochapụ ha nʼime ọzara.

Ezekiel 20:13 in English

Ezekiel 20:13 · Berean Standard Bible

Yet the house of Israel rebelled against Me in the wilderness. They did not follow My statutes and they rejected My ordinances—though the man who does these things will live by them—and they utterly profaned My Sabbaths. Then I resolved to pour out My wrath upon them and put an end to them in the wilderness.

Context

11Nʼebe ahụ ka m nọ nye ha iwu m niile, gosikwa ha ụkpụrụ m, gwa ha na onye ọbụla debere ha ga-adị ndụ. 12Ọzọ, e nyekwara m ha ụbọchị izuike, ka ọ bụrụ ihe ịrịbama dị nʼetiti mụ na ha, ka ha maara na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, na-edo ha nsọ. 13“ ‘Ma ụlọ nke Izrel nupuru isi megide m. Nʼime ọzara ahụ, ha jụrụ idebe iwu m. Ha agbasoghị usoro m, ọ bụ ezie na ịgbaso ya pụtara ịdị ndụ. Ha edebeghị ụbọchị izuike m nsọ. Nʼihi ya, ekpebikwara m na m ga-awụkwasị ha iwe ọkụ m, ka m kpochapụ ha nʼime ọzara. 14Ma nʼihi aha m, e mere m ihe ga-eme ka a ghara ime ya ka ọ hapụ ịdị nsọ nʼanya ndị mba niile, bụ ndị hụrụ mgbe m si Ijipt kpọpụta ha. 15Ma nʼime ọzara ahụ, eweliri m aka ṅụọrọ ha iyi na m agaghị eduba ha nʼala ahụ m nyere ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, ala ahụ kachasị ala niile ọzọ dị nʼụwa mma.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.