Izikiel 2:6
Ezekiel 2:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma gị nwa nke mmadụ, atụla ha egwu. Ka ụjọ okwu si ha nʼọnụ ghara ịtụkwa gị. Atụla egwu, ọ bụladị ma a sị na ogwu na uke gbara gị gburugburu, ọ bụladị ma a sị na i bi nʼetiti ụmụ akpị. Ka ụjọ ghara ịtụ gị nʼihi okwu ọnụ ha, ekwekwala ka ha menye gị egwu, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi.
Ezekiel 2:6 in English
Ezekiel 2:6 · Berean Standard Bible
But you, son of man, do not be afraid of them or their words. Do not be afraid, though briers and thorns surround you, and you dwell among scorpions. Do not be afraid of their words or dismayed by their presence, though they are a rebellious house.
Context
4Ndị ahụ m na-eziga gị ka i jekwuru bụ ndị isiike na ndị nnupu isi. Sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu.’ 5Ma ha gere gị ntị, ma ha egeghị gị ntị (ha bụ ndị na-enupu isi), ihe dị mkpa bụ na ha ga-amata na onye amụma anọọla nʼetiti ha. 6Ma gị nwa nke mmadụ, atụla ha egwu. Ka ụjọ okwu si ha nʼọnụ ghara ịtụkwa gị. Atụla egwu, ọ bụladị ma a sị na ogwu na uke gbara gị gburugburu, ọ bụladị ma a sị na i bi nʼetiti ụmụ akpị. Ka ụjọ ghara ịtụ gị nʼihi okwu ọnụ ha, ekwekwala ka ha menye gị egwu, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi. 7Ị ghaghị izi ha ozi m ziri gị zie ha, ma ha gere ntị ma ha egeghị ntị, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi. 8Ma gị, nwa nke mmadụ, gee ntị nʼihe m na-agwa gị. Enupula isi dịka ha si nupu isi. Meghee ọnụ gị taa ihe m ga-etinye gị nʼọnụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.