Izikiel 18:20
Ezekiel 18:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ahụ mere mmehie bụ onye ga-anwụ. Nwa agaghị ata ahụhụ nʼihi ihe nna ya metara, nna agakwaghị ata ahụhụ nʼihi ihe nwa ya metara. Onye ezi omume ga-anata ụgwọ ezi omume o mere, ma onye ajọ omume ga-anata ụgwọ nʼihi ajọ ihe o mere.
Ezekiel 18:20 in English
Ezekiel 18:20 · Berean Standard Bible
The soul who sins is the one who will die. A son will not bear the iniquity of his father, and a father will not bear the iniquity of his son. The righteousness of the righteous man will fall upon him, and the wickedness of the wicked man will fall upon him.
Context
18Ma nna ya ga-anwụ nʼihi mmehie niile o mere, nʼihi na ọ bụ onye na-ewe ihe na-abụghị nke ya, onye na-apụnara ndị ọzọ ihe ha nwere nʼike. Ọ bụkwa onye na-eme ihe ọjọọ dị iche iche nʼetiti ndị ya. 19“Ma unu na-ajụ, ‘Gịnị mere nwa adịghị eketa oke nʼahụhụ nke ajọ omume nna ya?’ Ihe dị otu ahụ apụghị ime, ebe ọ bụ na nwa ya emeela ihe ziri ezi ma leziekwa anya debezuo ụkpụrụ m niile, ọ ghaghị ịdị ndụ. 20Onye ahụ mere mmehie bụ onye ga-anwụ. Nwa agaghị ata ahụhụ nʼihi ihe nna ya metara, nna agakwaghị ata ahụhụ nʼihi ihe nwa ya metara. Onye ezi omume ga-anata ụgwọ ezi omume o mere, ma onye ajọ omume ga-anata ụgwọ nʼihi ajọ ihe o mere. 21“Ma ọ bụrụ na onye ajọ omume esite na mmehie niile o mere chigharịa, malite idebe ụkpụrụ m niile, ma na-emekwa ihe ziri ezi na nke dị mma, onye ahụ aghaghị ịdị ndụ, ọ gaghị anwụ. 22Ọ dịghị ajọ omume niile bụ nke ha mere a ga-echeta megide ha. Ha ga-adị ndụ nʼihi ihe ezi omume ha mere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.