Native Bible

Ezekiel 17:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

A kụrụ ya nʼebe ala dị mma, nʼakụkụ ọtụtụ mmiri, ka o nwee ike wapụta ngalaba, mịa mkpụrụ, ghọọkwa ezigbo vaịnị mara mma.’

Ezekiel 17:8 in English

Ezekiel 17:8 · Berean Standard Bible

It had been planted in good soil by abundant waters in order to yield branches and bear fruit and become a splendid vine.’

Context

6Ọ dịghị anya, mkpụrụ osisi ahụ gbara mgbọrọgwụ, too, ghọọ osisi vaịnị dị mkpụmkpụ, nke na-awasa awasa, nke alaka ya niile chere ihu nʼebe ugo ahụ nọ. O nwekwara alaka siri ike, na akwụkwọ mara mma. 7“ ‘Ma e nwekwara ugo ọzọ, nke nwere nku sara mbara, nke jupụtara nʼabụba. Mgbe ugo a bịara, osisi vaịnị a gbasakwara mgbọrọgwụ ya na alaka ya, chee ugo ahụ ihu, ka ọ gbakwasị ya mmiri. 8A kụrụ ya nʼebe ala dị mma, nʼakụkụ ọtụtụ mmiri, ka o nwee ike wapụta ngalaba, mịa mkpụrụ, ghọọkwa ezigbo vaịnị mara mma.’ 9“Sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ọ ga-adịhụkwa? Ọ bụ na agaghị ehopu mgbọrọgwụ ya niile, bipụkwa mkpụrụ ya niile mee ka ọ kpọnwụọ? Ka akwụkwọ ndụ niile nke na-epute ọhụrụ kpọnwụọ. Ọ gaghị ewekwa ogwe aka dị ike maọbụ ọtụtụ ndị mmadụ ihopụta ya site na mgbọrọgwụ ya. 10A kụọla ya ma ọ ga-etokwa? Ọ gaghị akpọnwụ kpamkpam mgbe oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ feturu ya, kpọnwụchakwaa nʼala ebe ahụ ọ nọ puo?’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.