Izikiel 17:23
Ezekiel 17:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ nʼelu ugwu niile nke Izrel ka m ga-akụnye ya. Ọ ga-awapụtakwa alaka ya, mịa mkpụrụ, bụrụkwa sida mara oke mma. Ụmụ nnụnụ dị iche iche ga-ewu akwụ ha na ya, ha ga-achọtakwa ebe obibi na ndo nke alaka ya niile.
Ezekiel 17:23 in English
Ezekiel 17:23 · Berean Standard Bible
I will plant it on the mountain heights of Israel so that it will bear branches; it will yield fruit and become a majestic cedar. Birds of every kind will nest under it, taking shelter in the shade of its branches.
Context
21Mma agha ka a ga-eji gbuo ndị agha ya niile na-agbapụ ọsọ, ndị niile fọdụrụ ka a ga-achụsasị nʼakụkụ niile. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. 22“ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Mụ onwe m ga-esi nʼọnụ ọnụ osisi kachasị mma nke osisi sida kachasị elu kụrụ ihe m ga-akụ. Aga m esi nʼọnụ ọnụ osisi sida dị elu kụrụ alaka dị nro, nke m ga-akụ nʼugwu dị ezigbo elu. 23Ọ bụ nʼelu ugwu niile nke Izrel ka m ga-akụnye ya. Ọ ga-awapụtakwa alaka ya, mịa mkpụrụ, bụrụkwa sida mara oke mma. Ụmụ nnụnụ dị iche iche ga-ewu akwụ ha na ya, ha ga-achọtakwa ebe obibi na ndo nke alaka ya niile. 24Nʼoge ahụ, osisi ọhịa niile ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, bụ onye na-egbuda osisi niile dị elu, ma na-ewelikwa ndị dị nta elu. Na ọ bụ m na-eme ka osisi dị ndụ kpọnwụọ, ma na-emekwa ka nke nwụrụ anwụ dịrị ndụ.
“ ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. Aghakwaghị m ime ya.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.