Izikiel 16:55
Ezekiel 16:55 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọzọ ndị ụmụnne gị nwanyị bụ Sọdọm na Sameria na ụmụ ha ndị inyom ga-alọta nʼọnọdụ mbụ ha; gị na ụmụ gị ndị inyom ga-alọtakwa nʼọnọdụ mbụ unu.
Ezekiel 16:55 in English
Ezekiel 16:55 · Berean Standard Bible
And your sisters, Sodom with her daughters and Samaria with her daughters, will return to their former state. You and your daughters will also return to your former state.
Context
53“ ‘Ma otu ọ dị, aga m eme ka ọganihu nke Sọdọm na ụmụ ya ndị inyom, na ọganihu nke Sameria na ụmụ ya ndị inyom, na ọganihu nke gị dịghachikwa nʼetiti ha: 54Ka i nwee ike bụrụ ọnọdụ ihere gị, ka ihere mekwa gị nʼihi ihe niile i mere, nʼịkasị ha obi. 55Ọzọ ndị ụmụnne gị nwanyị bụ Sọdọm na Sameria na ụmụ ha ndị inyom ga-alọta nʼọnọdụ mbụ ha; gị na ụmụ gị ndị inyom ga-alọtakwa nʼọnọdụ mbụ unu. 56Ma ị pụghị emeghe ọnụ gị kpọọ aha nwanne gị nwanyị bụ Sọdọm nʼụbọchị nganga gị, 57tupu e kpughe ajọ omume gị. Ọ bụladị otu ahụ, ugbu a ị bụ ihe ịkwa emo nye ndị ada Edọm* na ndị agbataobi ya niile, na ndị ada ndị Filistia. Ndị niile nọ gị gburugburu na-elelịkwa gị anya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.