Izikiel 16:38
Ezekiel 16:38 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m ata gị ahụhụ a na-ata ndị inyom na-akwa iko, na ndị inyom na-egbu mmadụ. Aga m eme ka ịbọ ọbọ ọbara nke ọnụma m, ya na ekworo m, bịakwasị gị.
Ezekiel 16:38 in English
Ezekiel 16:38 · Berean Standard Bible
And I will sentence you to the punishment of women who commit adultery and those who shed blood; so I will bring upon you the wrath of your bloodshed and jealousy.
Context
36Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Nʼihi na ị wụpụrụ agụụ nke anụ ahụ gị, kpugheekwa ọtọ gị nʼịkwa iko gị nke gị na ndị ị hụrụ nʼanya na-akwa, na nʼihi arụsị gị niile rụrụ arụ, nakwa nʼihi na ị nyere ha ọbara ụmụ gị, 37nʼihi ya, aga m achịkọta ndị niile bụ ndị ahụ niile ị hụrụ nʼanya, ndị gị na ha na-enwe obi ụtọ, ndị ị hụrụ nʼanya, ma ndị ị kpọrọ asị. Aga m achịkọta ha site gburugburu gị imegide gị, gbaa gị ọtọ nʼihu ha, ka ha hụ ọtọ gị niile. 38Aga m ata gị ahụhụ a na-ata ndị inyom na-akwa iko, na ndị inyom na-egbu mmadụ. Aga m eme ka ịbọ ọbọ ọbara nke ọnụma m, ya na ekworo m, bịakwasị gị. 39Aga m enyefe gị nʼaka ndị ahụ ị hụrụ nʼanya, bụ ọtụtụ mba ahụ dị iche iche. Ha ga-ebibi gị, kwada ụlọ ịkwa iko gị, na ụlọ arụsị gị niile dị elu, gbaa gị ọtọ, narakwa gị uwe gị niile, na ihe ịchọ mma gị niile, hapụ gị ka ihere mee gị. 40Ha ga-akpọta igwe mmadụ ga-emegide gị, ndị ga-atụ gị nkume, jirikwa mma agha ha bọkasịa gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.