Izikiel 16:17
Ezekiel 16:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị chịrị ọlaọcha na ọlaedo ndị ahụ mara mma, bụ nke m nyere gị, were ha kpụọrọ onwe gị oyiyi nwoke dị iche iche, ndị ị na-akpọ isiala nye. Nʼụzọ dị otu a ka gị na ha si na-akwakọ iko.
Ezekiel 16:17 in English
Ezekiel 16:17 · Berean Standard Bible
You also took the fine jewelry of gold and silver I had given you, and you made male idols with which to prostitute yourself.
Context
15“ ‘Ma ị tụkwasịrị mma gị obi, jiri nʼihi na a mara aha gị ghọọ onye akwụna. I wekwaara onwe gị nye nwoke ọbụla gabigara mee ka mma gị bụrụ nke ya. 16Ị were uwe gị ụfọdụ, meere onwe gị ebe dị iche iche dị elu nke tụrụ agwa, ebe doziri ihe ndina ịkwa iko gị. Ihe dị otu a emetụbeghị mbụ, ha ekwesịkwaghị ime mgbe ọbụla. 17Ị chịrị ọlaọcha na ọlaedo ndị ahụ mara mma, bụ nke m nyere gị, were ha kpụọrọ onwe gị oyiyi nwoke dị iche iche, ndị ị na-akpọ isiala nye. Nʼụzọ dị otu a ka gị na ha si na-akwakọ iko. 18Uwe ọma ahụ a kpara akpa ka i ji kpuchie ha. Mmanụ m na ụda m na-esi isi ụtọ ka ị chere nʼihu ha dịka onyinye. 19Ọzọkwa, ụtụ ọka ọma, mmanụ oliv na mmanụ aṅụ, nri ndị m nyere gị ka i rie, ka i ji chụọ aja na-esi isi ụtọ nʼihu ha. Otu a ka o si dị, ka Onyenwe anyị Onyenwe anyị kwupụtara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.