Izikiel 16:12
Ezekiel 16:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Etinyekwara m gị ọla nʼimi, tinye gị ọlantị abụọ na ntị gị, na okpueze mara mma nʼisi gị.
Ezekiel 16:12 in English
Ezekiel 16:12 · Berean Standard Bible
I put a ring in your nose, earrings on your ears, and a beautiful crown upon your head.
Context
10Enyere m gị akwa ọcha na uwe a kpara nke ọma, nke i ji kpuchie ahụ gị. Nyekwa gị akpụkpọụkwụ e ji ezi akpụkpọ kwaa, jirikwa ezi akwa ọcha na uwe ndị dị oke ọnụ kpuchie gị. 11Eyinyere m gị ihe ịchọ mma, tinye ọlaaka nʼaka gị, nakwa ọlaolu nʼolu gị. 12Etinyekwara m gị ọla nʼimi, tinye gị ọlantị abụọ na ntị gị, na okpueze mara mma nʼisi gị. 13E ji ihe ịchọ mma ọlaọcha na ọlaedo chọọ gị mma. Uwe gị bụkwa uwe ezi akwa ọcha, uwe dị oke ọnụ, na uwe a kpara nke ọma. Nri ị na-eri bụ ụtụ ọka a yọchaziri nke ọma, na mmanụ aṅụ, na mmanụ oliv. Mma gị pụtaziri ihe nke ọma, ị ruo ogo ịbụ eze nwanyị. 14Aha gị dara ụda nke ukwuu nʼetiti mba dị iche iche nʼihi mma gị, nke zuruoke site nʼebube ahụ bụ nke m tụkwasịrị gị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.