Izikiel 13:2
Ezekiel 13:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nwa nke mmadụ, buo amụma megide ndị amụma nke Izrel ndị na-ebu amụma ugbu a, gwa ndị amụma ahụ na-ekwu ihe sitere ha nʼuche: ‘Nụrụnụ okwu nke Onyenwe anyị.
Ezekiel 13:2 in English
Ezekiel 13:2 · Berean Standard Bible
“Son of man, prophesy against the prophets of Israel who are now prophesying. Tell those who prophesy out of their own imagination: Hear the word of the LORD!
Context
1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Nwa nke mmadụ, buo amụma megide ndị amụma nke Izrel ndị na-ebu amụma ugbu a, gwa ndị amụma ahụ na-ekwu ihe sitere ha nʼuche: ‘Nụrụnụ okwu nke Onyenwe anyị. 3Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ahụhụ ga-adịrị ndị amụma nzuzu ndị na-agbaso mmụọ nke onwe ha, ndị ọ dịghị ihe ha na-ahụ. 4Gị Izrel, lee, ndị amụma gị niile dị ka nkịta ọhịa bi na mkpọmkpọ ebe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.