Native Bible

Ezekiel 13:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu a ka m ga-esi gosipụta iwe m nʼebe mgbidi ahụ nọ, na nʼahụ ndị ahụ ji nzu techie ya. Aga m asị unu, “Mgbidi ahụ adịghịkwa, otu a ka ọ dịkwa ndị ahụ ji nzu techie ya,

Ezekiel 13:15 in English

Ezekiel 13:15 · Berean Standard Bible

And after I have vented My wrath against the wall and against those who whitewashed it, I will say to you: ‘The wall is gone, and so are those who whitewashed it—

Context

13“ ‘Ya mere, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, aga m eji oke ifufe nke ọnụma m, na oke mmiri ozuzo nke iwe m, ma oke akụmmiri nke oke iwe m mebie ya. 14Aga m akwada mgbidi ahụ unu tere nzu, aga m emekwa ka ọ daruo ala nke ga-eme ka ahụ ntọala ya anya; ọ ga-adakwasịkwa unu, gwepịa unu. Mgbe ọ dara ọ ga-egbuchapụ unu niile; unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. 15Otu a ka m ga-esi gosipụta iwe m nʼebe mgbidi ahụ nọ, na nʼahụ ndị ahụ ji nzu techie ya. Aga m asị unu, “Mgbidi ahụ adịghịkwa, otu a ka ọ dịkwa ndị ahụ ji nzu techie ya, 16bụ ndị amụma Izrel ndị ahụ buru amụma nye Jerusalem, ndị hụkwara ya ọhụ udo mgbe udo na-adịghị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.” ’ 17“Ma ugbu a, gị nwa nke mmadụ, chee ihu nʼebe ụmụada ndị unu nọ, ndị nke na-ebu amụma dị ka o si si ha nʼobi pụta. Buo amụma megide ha

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.