Izikiel 12:24
Ezekiel 12:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na agaghị enwekwa ọhụ ụgha ọzọ, maọbụ ịjụ ase ire ụtọ nʼetiti ụlọ Izrel.
Ezekiel 12:24 in English
Ezekiel 12:24 · Berean Standard Bible
For there will be no more false visions or flattering divinations within the house of Israel,
Context
22“Nwa nke mmadụ, kedụ ihe ilu a na-atụ nʼIzrel pụtara, nke na-asị ‘Ụbọchị adịla oke anya, ọhụ niile abụrụkwala ihe na-enweghị isi?’ 23Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Aga m eme ka ilu a kwụsị, ha agaghị atụkwa ya dịka ilu nʼIzrel ọzọ.’ Kama gwa ha, ‘Nʼụbọchị ahụ adịla nso mgbe ọhụ niile ga-emezu. 24Nʼihi na agaghị enwekwa ọhụ ụgha ọzọ, maọbụ ịjụ ase ire ụtọ nʼetiti ụlọ Izrel. 25Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-ekwu ihe m zubere. Ihe ọbụla m kwuru ga-emezu na-atụfughị oge. Nʼihi na ọ bụ nʼoge unu dị ndụ, unu ndị nnupu isi, ka m ga-emezu ihe ọbụla bụ nke m kwuru. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’ ” 26Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.