Native Bible

Ezekiel 10:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Cherubim ndị ahụ na-eguzo nʼakụkụ ndịda nke ụlọnsọ ahụ mgbe nwoke ahụ banyere. Igwe ojii jupụtakwara nʼogige ime ụlọnsọ ahụ.

Ezekiel 10:3 in English

Ezekiel 10:3 · Berean Standard Bible

Now when the man went in, the cherubim were standing on the south side of the temple, and a cloud filled the inner court.

Context

1Mgbe ahụ, elere m anya hụ ocheeze ọma e ji nkume safaia wuo ka ọ pụtara ihe na mbara eluigwe, nʼelu ebe ahụ isi cherubim ndị ahụ dị. 2Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, “Baa nʼetiti ụkwụ ụgbọala ahụ dị nʼokpuru cherubim ndị ahụ. Site nʼetiti cherubim ndị ahụ kpojuo icheku ọkụ nke na-ere ere nʼaka gị, fesachaa ha nʼime obodo ahụ niile.” Ọ bara nʼime ka m nʼele ya anya. 3Cherubim ndị ahụ na-eguzo nʼakụkụ ndịda nke ụlọnsọ ahụ mgbe nwoke ahụ banyere. Igwe ojii jupụtakwara nʼogige ime ụlọnsọ ahụ. 4Mgbe ahụ, ebube Onyenwe anyị sitere nʼelu cherubim bilie, bịa guzo nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ. Ụlọnsọ ahụ jupụtakwara nʼigwe ojii, ihe nke ebube Onyenwe anyị jupụtakwara nʼogige ụlọnsọ ahụ. 5Ụzụ nke nku cherubim ndị ahụ na-eme dịkwa ka olu Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. A na-anụkwa ụzụ nku ndị ahụ nʼogige ụlọnsọ ahụ dị nʼezi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.