Izikiel 10:18
Ezekiel 10:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emesịa, ebube nke Onyenwe anyị sitere na mbata ọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ pụọ, gaa guzo nʼelu cherubim ndị ahụ.
Ezekiel 10:18 in English
Ezekiel 10:18 · Berean Standard Bible
Then the glory of the LORD moved away from the threshold of the temple and stood above the cherubim.
Context
16Mgbe cherubim ndị ahụ na-aga, wịịlu ndị ahụ dị nʼakụkụ ha na-eso ha na-aga. Mgbe ha na-achili nku ha i si nʼala bulie onwe ha elu, wịịlu ha na-anọgidekwa nʼakụkụ ha. 17Mgbe cherubim ndị ahụ guzoro nʼotu ebe, wịịlu ahụ na-eguzokwa. Mgbe ha na-ebuli onwe ha elu, wịịlu ndị ahụ na-ebulikwa onwe ha elu, nʼihi na mmụọ nke ihe ahụ dị ndụ dị nʼime ha. 18Emesịa, ebube nke Onyenwe anyị sitere na mbata ọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ pụọ, gaa guzo nʼelu cherubim ndị ahụ. 19Mgbe m nọ na-ele anya, cherubim ahụ gbasapụrụ nku ha felie, wịịlu ha niile dịkwa nʼakụkụ ha. Ha guzoro na mbata ọnụ ụzọ nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ụlọ Onyenwe anyị, na ebube nke Chineke nke Izrel dịkwa nʼelu ha. 20Ndị a bụ ihe ndị ahụ dị ndụ, nke m hụrụ nʼokpuru Chineke Izrel nʼakụkụ osimiri Keba, amatara m na ha bụ cherubim.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.