Native Bible

Ezekiel 10:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Cherubim ndị ahụ buliri onwe ha elu. Ndị a bụ ihe ndị ahụ dị ndụ nke m hụrụ na mbụ nʼakụkụ osimiri Keba.

Ezekiel 10:15 in English

Ezekiel 10:15 · Berean Standard Bible

Then the cherubim rose upward. These were the living creatures I had seen by the River Kebar.

Context

13Aha m nụrụ a na-akpọ wịịlu ndị ahụ bụ, Ọgba gburugburu. 14Nke ọbụla nʼime cherubim ndị a nwere ihu anọ. Ihu nke mbụ dịka ihu cherub. Nke abụọ dịka ihu mmadụ; nke atọ dịka ihu ọdụm, ma nke anọ dịka ihu ugo. 15Mgbe ahụ, Cherubim ndị ahụ buliri onwe ha elu. Ndị a bụ ihe ndị ahụ dị ndụ nke m hụrụ na mbụ nʼakụkụ osimiri Keba. 16Mgbe cherubim ndị ahụ na-aga, wịịlu ndị ahụ dị nʼakụkụ ha na-eso ha na-aga. Mgbe ha na-achili nku ha i si nʼala bulie onwe ha elu, wịịlu ha na-anọgidekwa nʼakụkụ ha. 17Mgbe cherubim ndị ahụ guzoro nʼotu ebe, wịịlu ahụ na-eguzokwa. Mgbe ha na-ebuli onwe ha elu, wịịlu ndị ahụ na-ebulikwa onwe ha elu, nʼihi na mmụọ nke ihe ahụ dị ndụ dị nʼime ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.