Izikiel 10:11
Ezekiel 10:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ha na-aga, ha niile na-eche ihu nʼakụkụ ọbụla nke cherubim ndị ahụ chere ihu. Wịịlu ndị a adịghị echigharị echigharị mgbe cherubim ndị a na-agagharị. Kama ebe isi cherubim ndị ahụ chere ihu ka wịịlu ndị ahụ na-aga. Ha adịghị elekwa* anya nʼazụ dịka ha na-aga.
Ezekiel 10:11 in English
Ezekiel 10:11 · Berean Standard Bible
When they moved, they would go in any of the four directions, without turning as they moved. For wherever the head faced, the cherubim would go in that direction, without turning as they moved.
Context
9Elere m anya hụ wịịlu anọ, nke dị nʼakụkụ cherubim ndị ahụ. Cherubim ọbụla nwere otu wịịlu nʼakụkụ ya. Wịịlu ndị a niile na-egbu maramara dịka nkume beril. 10Wịịlu anọ ndị ahụ yiri onwe ha. Nke ọbụla nʼime ha dịka wịịlu a rụnyere nʼetiti wịịlu ọzọ. 11Mgbe ha na-aga, ha niile na-eche ihu nʼakụkụ ọbụla nke cherubim ndị ahụ chere ihu. Wịịlu ndị a adịghị echigharị echigharị mgbe cherubim ndị a na-agagharị. Kama ebe isi cherubim ndị ahụ chere ihu ka wịịlu ndị ahụ na-aga. Ha adịghị elekwa* anya nʼazụ dịka ha na-aga. 12Gburugburu ha, nʼanụ ahụ ha niile, ma nʼazụ ha, ma nʼaka ha, ma na nku ha, ma na wịịlu ndị ahụ, ihe jupụtara ha bụ anya. Anya dị nʼakụkụ ha niile. 13Aha m nụrụ a na-akpọ wịịlu ndị ahụ bụ, Ọgba gburugburu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.