Native Bible

Ezekiel 1:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha niile gawara nʼihu. Ebe ọbụla mmụọ ahụ gara ka ha na-aga, na-eleghị anya nʼazụ.

Ezekiel 1:12 in English

Ezekiel 1:12 · Berean Standard Bible

Each creature went straight ahead. Wherever the spirit would go, they would go, without turning as they moved.

Context

10Maka oyiyi ihu ha: Ha anọ nwere ihu mmadụ, nʼakụkụ aka nri ha nwere ihu ọdụm, nʼakụkụ aka ekpe ha bụ ihu ehi, onye ọbụla nwekwara ihu ugo. 11Otu ahụ ka ihu ha niile dị. Ha gbasara nku ha nʼelu, nke ọbụla nwere nku abụọ, otu nʼime nku ndị a na-emetụ nku nke ibe ya, ebe abụọ kpuchiri ahụ ha. 12Ha niile gawara nʼihu. Ebe ọbụla mmụọ ahụ gara ka ha na-aga, na-eleghị anya nʼazụ. 13Nʼetiti ihe ndị a dị ndụ, e nwere ihe dịka icheku ọkụ na-enwu enwu, dịkwa ka ọwa na-enwu ọkụ. Ọkụ na-esi nʼetiti ihe ndị ahụ dị ndụ na-aga ihu na azụ, ọkụ ahụ nwupụrụ enwupụ, amụma eluigwe sikwa na ya egbupụta. 14Ihe ndị ahụ dị ndụ na-efegharị nʼebe a, na-efegharịkwa nʼebe nke ọzọ, dịka mgbe amụma na-egbu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.