Native Bible

Exodus 9:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis, “Setịpụ aka gị nʼeluigwe. Nke a ga-eme ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so malite izokwasị ala Ijipt niile, na ụmụ mmadụ, na anụmanụ, na ihe niile a kụrụ nʼubi nʼIjipt.”

Exodus 9:22 in English

Exodus 9:22 · Berean Standard Bible

Then the LORD said to Moses, “Stretch out your hand toward heaven, so that hail may fall on all the land of Egypt—on man and beast and every plant of the field throughout the land of Egypt.”

Context

20Ụfọdụ ndị na-ejere Fero ozi, ndị na-atụ okwu Onyenwe anyị egwu mere ngwangwa gaa dulata anụ ụlọ ha, na ndị ohu ha. 21Ma ndị ahụ na-enweghị nrube isi nye okwu Onyenwe anyị hapụrụ ndị ohu ha nakwa anụ ụlọ ha nʼọhịa. 22Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis, “Setịpụ aka gị nʼeluigwe. Nke a ga-eme ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so malite izokwasị ala Ijipt niile, na ụmụ mmadụ, na anụmanụ, na ihe niile a kụrụ nʼubi nʼIjipt.” 23Mgbe Mosis setịpụrụ mkpanaka ya nʼihu eluigwe, Onyenwe anyị zidatara egbe eluigwe na oke ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so. Amụma egbe eluigwe chakwara nʼala. Ya mere, Onyenwe anyị zidatara oke ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so nʼala Ijipt. 24Mkpụrụ mmiri dara, amụma gbukwara nʼihu nakwa nʼazụ. Nʼezie, ọ bụ oke ifufe dị njọ, ụdị nke a na-ahụtụbeghị nʼala Ijipt kemgbe ọ ghọrọ nnukwu mba.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.