Ọpụpụ 8:25
Exodus 8:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ihe ndị a na-eme, Fero kpọrọ Mosis na Erọn gwa ha okwu sị, “Gaanụ chụọrọ Chineke unu aja, ma ka ọ bụrụ nʼala Ijipt.”
Exodus 8:25 in English
Exodus 8:25 · Berean Standard Bible
Then Pharaoh summoned Moses and Aaron and said, “Go, sacrifice to your God within this land.”
Context
23Aga m emekwa ka ọ pụta ìhè na o nwere ihe dị iche nʼetiti ndị m na ndị gị. Ihe ịrịbama a ga-emezukwa echi.’ ” 24Nʼechi ya, Onyenwe anyị mere dịka o kwuru. Igwe ijiji dị egwu nʼọnụọgụgụ bịara nʼala Ijipt, jupụta nʼụlọ Fero, na nʼụlọ ndị niile na-ejere ya ozi, na nʼala Ijipt niile. E mere ka ala Ijipt bụrụ ihe e ji ijiji mebie. 25Mgbe ihe ndị a na-eme, Fero kpọrọ Mosis na Erọn gwa ha okwu sị, “Gaanụ chụọrọ Chineke unu aja, ma ka ọ bụrụ nʼala Ijipt.” 26Mosis zaghachiri Fero sị, “Nke ahụ abụghị ihe ziri ezi, nʼihi na aja anyị na-aga ịchụrụ Onyenwe anyị Chineke anyị bụ ihe rụrụ arụ nʼanya ndị Ijipt. Ọ bụrụ na anyị achụọ aja a nʼihu ha, ha ga-eji nkume tugbuo anyị. 27Anyị ga-aga njem ụbọchị atọ nʼime ọzara gaa chụọrọ Onyenwe anyị Chineke anyị aja, dịka o nyere anyị iwu ka anyị mee.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.