Native Bible

Exodus 8:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị Ijipt na-eme majiki gbalịrị iji ihe nzuzo ha mee otu ihe ahụ Erọn mere, ma ha enweghị ike ime ka anwụ nta ọbụla pụta. Ebe ọ bụ na anwụ nta ndị a jupụtara nʼahụ mmadụ na nʼahụ anụmanụ niile.

Exodus 8:18 in English

Exodus 8:18 · Berean Standard Bible

The magicians tried to produce gnats using their magic arts, but they could not. And the gnats remained on man and beast.

Context

16Ya mere, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Gwa Erọn, setịpụ mkpanaka gị, tie nʼaja nke ala nʼala Ijipt niile, aja ya ga-aghọ anwụ nta nke na-ata ata.” 17Mosis na Erọn mere nke a. Mgbe Erọn setịpụrụ aka tie mkpanaka ya nʼelu ala, anwụ nta jupụtara nʼala Ijipt niile, nʼahụ ndị mmadụ, na nʼahụ anụmanụ ha. Ndanda ndị a jupụtakwara nʼuzuzu niile dị nʼala ahụ. 18Ndị Ijipt na-eme majiki gbalịrị iji ihe nzuzo ha mee otu ihe ahụ Erọn mere, ma ha enweghị ike ime ka anwụ nta ọbụla pụta. Ebe ọ bụ na anwụ nta ndị a jupụtara nʼahụ mmadụ na nʼahụ anụmanụ niile. 19Naanị ihe ndị na-eme majiki gwara Fero bụ, “Nke a bụ akaọrụ Chineke.” Ma Fero mere ka obi ya sie ike. Ọ chọghị ige, ọ bụladị ndị majiki ya ntị, dịka Onyenwe anyị kwuru na ọ ga-eme. 20Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Bilie nʼisi ụtụtụ echi jekwuru Fero. Mgbe ọ ga-aga nʼosimiri,* gwa ya okwu sị, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.