Ọpụpụ 7:2
Exodus 7:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị ga-agwa Erọn ihe niile m gwara gị. Ọ ga-ekwukwa ha nʼihu Fero, rịọọ ya ka o kwere ka ụmụ Izrel hapụ ala Ijipt.
Exodus 7:2 in English
Exodus 7:2 · Berean Standard Bible
You are to speak all that I command you, and your brother Aaron is to tell Pharaoh to let the Israelites go out of his land.
Context
1Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Emeela m gị ka ị dịrị ka Chineke nʼebe Fero nọ. Nwanne gị Erọn ga-abụkwa onye amụma gị.* 2Ị ga-agwa Erọn ihe niile m gwara gị. Ọ ga-ekwukwa ha nʼihu Fero, rịọọ ya ka o kwere ka ụmụ Izrel hapụ ala Ijipt. 3Ma aga m eme ka obi Fero sie ike. Ọ bụ ezie na m ga-eme ọtụtụ ihe ịrịbama nʼihe ebube nʼala Ijipt, 4ma Fero agaghị ege unu ntị. Mgbe ahụ aga m eme ka aka m bịakwasị Ijipt. Aga m esite nʼoke ọrụ nke ikpe ọmụma dị oke egwu, mee ka ndị m, Izrel, dịka usuu ha niile si dị, site nʼala Ijipt pụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.