Ọpụpụ 7:16
Exodus 7:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị ga-agwa Fero sị, ‘Onyenwe anyị, Chineke ndị Hibru, ezitela m ka m gwa gị sị, hapụ ndị m ka ha gaa nʼọzara fee m ofufe. Tutu ruo ugbu a, ị jụrụ ige ntị.’
Exodus 7:16 in English
Exodus 7:16 · Berean Standard Bible
Then say to him, ‘The LORD, the God of the Hebrews, has sent me to tell you: Let My people go, so that they may worship Me in the wilderness. But you have not listened until now.
Context
14Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Obi Fero siri ike. Ọ bụ nke a mere o ji na-aga nʼihu na-ajụ ka ndị m laa. 15Ma otu ọ dị; nʼisi ụtụtụ echi, jekwuru Fero tupu ọ gaa nʼosimiri.* Guzoro nʼakụkụ osimiri Naịl, jidekwa mkpanaka ahụ ghọrọ agwọ nʼaka gị. 16Ị ga-agwa Fero sị, ‘Onyenwe anyị, Chineke ndị Hibru, ezitela m ka m gwa gị sị, hapụ ndị m ka ha gaa nʼọzara fee m ofufe. Tutu ruo ugbu a, ị jụrụ ige ntị.’ 17Ugbu a Onyenwe anyị kwuru nke a sị, ‘Ị ga-amata site na nke a na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. Aga m ewere mkpanaka a nke m ji nʼaka tie nʼosimiri Naịl. Ọ ga-agbanwe ghọọ ọbara. 18Azụ niile dị nʼime ya ga-anwụ. Osimiri ahụ ga-esikwa isi dịka ihe rere ure. Nke a ga-eme ka ọ bụrụ ihe rara ahụ nye ndị Ijipt ịṅụ mmiri site na ya.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.