Ọpụpụ 5:1
Exodus 5:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emesịa, Mosis na Erọn jekwuuru Fero guzo nʼihu ya gwa ya okwu sị, “Ihe a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Hapụ ndị m ka ha gaa meere m mmemme dị nsọ nʼime ọzara.’ ”
Exodus 5:1 in English
Exodus 5:1 · Berean Standard Bible
After that, Moses and Aaron went to Pharaoh and said, “This is what the LORD, the God of Israel, says: ‘Let My people go, so that they may hold a feast to Me in the wilderness.’”
Context
1Emesịa, Mosis na Erọn jekwuuru Fero guzo nʼihu ya gwa ya okwu sị, “Ihe a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Hapụ ndị m ka ha gaa meere m mmemme dị nsọ nʼime ọzara.’ ” 2Fero zara sị, “Onye ka Onyenwe anyị bụ m ga-eji gee ntị nʼolu ya ịhapụ ụmụ Izrel ka ha si nʼebe a pụọ? Amaghị m onye ọ bụ, agaghị m ekwekwa ka Izrel gaa ebe ọbụla.” 3Ha zara sị, “Chineke ndị Hibru zutere anyị. Biko kwere ka anyị gaa njem ụbọchị atọ* nʼime ọzara nọọ nʼebe ahụ chụọrọ Onyenwe anyị Chineke anyị aja. Ọ bụrụ na anyị ajụ ige ntị nʼolu ya, ọ ga-eji ọrịa ọjọọ maọbụ mma agha kpochapụ anyị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.