Ọpụpụ 4:29
Exodus 4:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mosis na Erọn jeruru Ijipt kpọọ nzukọ ndị okenye ụmụ Izrel niile.
Exodus 4:29 in English
Exodus 4:29 · Berean Standard Bible
Then Moses and Aaron went and assembled all the elders of the Israelites,
Context
27Ugbu a, Onyenwe anyị gwara Erọn okwu sị, “Gaa nʼime ọzara ka izute Mosis.” Erọn gara jekwuru Mosis nʼugwu Horeb, ugwu Chineke, sutu ya ọnụ. 28Mgbe ahụ Mosis gwara Erọn ihe niile Onyenwe anyị ziri ya ka o kwuo, ya na ihe ịrịbama ndị ahụ niile o nyere nʼiwu ka o mee. 29Mosis na Erọn jeruru Ijipt kpọọ nzukọ ndị okenye ụmụ Izrel niile. 30Erọn gwara ha ihe niile Onyenwe anyị gwara Mosis. Mosis, nʼonwe ya mere ihe ịrịbama ahụ niile nʼihu anya ha. 31Mgbe ahụ, ha kwenyere; dịka ha nụrụ na Onyenwe anyị eletala ụmụ Izrel, ma hụkwa ahụhụ ha. Ha kpọrọ isiala fee ya ofufe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.