Ọpụpụ 4:13
Exodus 4:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ rịọrọ, “Biko Onyenwe m, ziganụ onye ọzọ.”
Exodus 4:13 in English
Exodus 4:13 · Berean Standard Bible
But Moses replied, “Please, Lord, send someone else.”
Context
11Onyenwe anyị jụrụ Mosis ajụjụ sị, “Onye mere ọnụ mmadụ? Onye na-emekwa ka ntị mmadụ chie ya, maọbụ ka mmadụ daa ogbi? Onye na-eme ka mmadụ hụ ụzọ, maọbụ kpụọ ìsì? Ọ bụghị mụ onwe m bụ Onyenwe anyị? 12Ugbu a, gaa mee ihe m gwara gị. Aga m enyere gị aka ikwu okwu nke ọma. Aga m agwakwa gị ihe ị ga-ekwu.” 13Ma ọ rịọrọ, “Biko Onyenwe m, ziganụ onye ọzọ.” 14Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide Mosis sị ya, “Kedụ maka nwanne gị nwoke Erọn onye Livayị, amaara m na ọ bụ onye ọka okwu. Lee, ọ na-abịa izute gị. Ọ ga-aṅụrị ọṅụ mgbe ọ chọtara gị. 15Ị ga-agwa ya okwu, tinye okwu gị nʼọnụ ya. Aga m enyere unu abụọ aka ikwu okwu nke ọma, aga m ezikwa unu abụọ ihe unu ga-eme.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.