Native Bible

Exodus 39:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe ike nʼukwu bụ nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie uhie, na uhie uhie, nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, ọrụ aka onye ǹka na-akpanye ihe ịchọ mma, dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu.

Exodus 39:29 in English

Exodus 39:29 · Berean Standard Bible

and the sash of finely spun linen, embroidered with blue, purple, and scarlet yarn, just as the LORD had commanded Moses.

Context

27Ha ji ezi akwa ọcha metara Erọn na ụmụ ya ndị ikom, uwe ime ahụ, akaọrụ nke onye ọkpa akwa, 28jirikwa ezi akwa ọcha mee akwa ike nʼisi, okpu akwa ọcha, na uwe ukwu nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma. 29Ihe ike nʼukwu bụ nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie uhie, na uhie uhie, nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, ọrụ aka onye ǹka na-akpanye ihe ịchọ mma, dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu. 30Ha mere efere, bụ okpu nsọ ahụ, site nʼọlaedo a nụchara anụcha, gbunyekwa akara nʼelu ya, dịka ihe e dere nʼelu mgbaaka akara: Ihe nsọ dịrị Onyenwe anyị. 31Mgbe ahụ, ha kenyere ya eriri na-acha anụnụ anụnụ i ji jikọta ya na ihe ike nʼisi ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.