Native Bible

Exodus 39:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, nke na-acha uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma kpanye oyiyi mkpụrụ pomegranet, gburugburu nʼọnụ ala ala uwe mwụda ahụ.

Exodus 39:24 in English

Exodus 39:24 · Berean Standard Bible

They made pomegranates of blue, purple, and scarlet yarn and finely spun linen on the lower hem of the robe.

Context

22Ọ bụ akwa nke na-acha anụnụ anụnụ,* ka ha ji dụọ uwe mwụda efọọd ahụ, ọrụ onye okwe akwa. 23A ga-enwe oghere nʼetiti uwe mwụda ahụ, dịka oghere olu uwe agha, nwekwa akwa nta a dụnyere nʼokpuru oghere a, ime ka o sie ike gharakwa ịdọka. 24Ha ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, nke na-acha uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma kpanye oyiyi mkpụrụ pomegranet, gburugburu nʼọnụ ala ala uwe mwụda ahụ. 25Ha dụnyekwara ataṅụ e ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ, gburugburu nʼọnụ ọnụ ala ya nʼetiti pomegranet ndị ahụ. 26Otu ataṅụ, otu oyiyi mkpụrụ pomegranet, otu a ka a dụnyere ya gburugburu ọnụ ọnụ ala uwe mwụda ahụ, nke a ga-eyi mgbe a na-eje ozi, dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.