Ọpụpụ 39:20
Exodus 39:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ha kpụrụ mgbaaka ọlaedo abụọ ọzọ, konyekwa ha nʼelu ubu abụọ nke efọọd ahụ, nʼokpuru nʼebe ihu ya, na nso nso ebe a dụkọtara, nʼelu ihe okike ukwu nke efọọd ahụ.
Exodus 39:20 in English
Exodus 39:20 · Berean Standard Bible
They made two additional gold rings and attached them to the bottom of the two shoulder pieces of the ephod, on its front, near the seam just above its woven waistband.
Context
18Were isi ndị ọzọ nke ụdọ ahụ dụnye nʼihe ahụ a kpara akpa. Konye ha nʼelu ubu efọọd ahụ, nʼebe ihu ya. 19Ha mere mgbaaka ọlaedo. Konyekwa ha na nkuku abụọ nke ihe mgbochi obi ahụ, nʼime ọnụ ọnụ ya ebe dị nso efọọd ahụ. 20Mgbe ahụ, ha kpụrụ mgbaaka ọlaedo abụọ ọzọ, konyekwa ha nʼelu ubu abụọ nke efọọd ahụ, nʼokpuru nʼebe ihu ya, na nso nso ebe a dụkọtara, nʼelu ihe okike ukwu nke efọọd ahụ. 21Ha jikwa eriri na-acha anụnụ kekọta mgbaaka ihe mgbochi obi ahụ na mgbaaka efọọd ahụ, jikọta ya na ihe okike ukwu ahụ, ime ka ihe mgbochi obi ahụ hapụ ịtọghapụ site nʼefọọd ahụ, dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị. 22Ọ bụ akwa nke na-acha anụnụ anụnụ,* ka ha ji dụọ uwe mwụda efọọd ahụ, ọrụ onye okwe akwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.