Ọpụpụ 39:17
Exodus 39:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha dụnyere ụdọ ọlaedo abụọ ndị ahụ nʼelu mgbaaka ndị ahụ dị na nkuku ihe mgbochi obi ahụ.
Exodus 39:17 in English
Exodus 39:17 · Berean Standard Bible
Then they fastened the two gold chains to the two gold rings at the corners of the breastpiece,
Context
15Ha ji ọlaedo a nụchara anụcha mee eriri a kpara akpa dịka ụdọ, maka ihe mgbochi obi. 16Ha mere ihe ọlaedo abụọ nke a kpara akpa, ya na mgbaaka ọlaedo abụọ. Dụnyekwa mgbaaka ndị ahụ na nkuku abụọ nke ihe mgbochi obi ahụ. 17Ha dụnyere ụdọ ọlaedo abụọ ndị ahụ nʼelu mgbaaka ndị ahụ dị na nkuku ihe mgbochi obi ahụ. 18Were isi ndị ọzọ nke ụdọ ahụ dụnye nʼihe ahụ a kpara akpa. Konye ha nʼelu ubu efọọd ahụ, nʼebe ihu ya. 19Ha mere mgbaaka ọlaedo. Konyekwa ha na nkuku abụọ nke ihe mgbochi obi ahụ, nʼime ọnụ ọnụ ya ebe dị nso efọọd ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.