Ọpụpụ 38:28
Exodus 38:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ịdị arọ nke ọlaọcha e ji menye nko nʼibo osisi niile, na nke e ji machie okporo osisi niile, na nke e ji techie isi ogidi osisi niile, bụ iri kilogram abụọ.
Exodus 38:28 in English
Exodus 38:28 · Berean Standard Bible
With the 1,775 shekels of silver * he made the hooks for the posts, overlaid their tops, and supplied bands for them.
Context
26Ha niile tụrụ otu beka, otu isi, dịka ụtụ mgbe e kere ụtụ ọkara shekel dịka ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị, e nyere nʼisi onye ọbụla nke gabigara nʼebe ndị a gụrụ ọnụ nọ, bụ ndị gbara iri afọ abụọ rigoo. Ọnụọgụgụ ha dị narị isii, na puku atọ, na narị ise, na iri ise. 27Ịdị arọ nke ọlaọcha niile e ji rụọ ụkwụ ibo niile nke ebe nsọ ahụ, na ụkwụ ogidi niile e ji jidesie akwa mgbochi ndị ahụ ike bụ puku kilogram atọ, na narị kilogram isii. Ịdị arọ nke ọlaọcha e ji wuo ụkwụ ọbụla bụ iri kilogram atọ na isii. 28Ịdị arọ nke ọlaọcha e ji menye nko nʼibo osisi niile, na nke e ji machie okporo osisi niile, na nke e ji techie isi ogidi osisi niile, bụ iri kilogram abụọ. 29Ịdị arọ nke bronz niile ndị mmadụ wetara dịka onyinye aja mfufe bụ puku kilogram atọ, na narị kilogram atọ, na iri isii. 30E ji bronz ndị a wuo ụkwụ ogidi niile a manyere nʼihu ụzọ e si abata ogige ụlọ nzute ahụ. E jikwa ya wuo ebe ịchụ aja bronz ahụ, na ihe ọkpụkpụ bronz ahụ, na ngwongwo niile e ji eje ozi nʼebe ịchụ aja,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.