Native Bible

Exodus 38:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ịdị arọ nke onyinye ọlaedo niile sitere nʼaja mfufe ahụ nke ndị mmadụ wetara maka ịrụ ebe nsọ ahụ, bụ otu puku na narị kilogram ise.

Exodus 38:24 in English

Exodus 38:24 · Berean Standard Bible

All the gold from the wave offering used for the work on the sanctuary totaled 29 talents and 730 shekels,* according to the sanctuary shekel.

Context

22Bezalel, nwa Uri, nwa Hua, onye si nʼebo Juda, rụzuru ihe niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu. 23Onye na-enyere ya aka bụ Oholiab nwa Ahisamak, onye ebo Dan, bụ onye ọka a maara aha ya, ọ bụ onye ọka ihe ọtụtụ, na onye ọka ịdụnye ihe ịchọ mma dị iche iche nʼakwa na-acha anụnụ anụnụ, nke ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie nakwa ezi akwa ọcha. 24Ịdị arọ nke onyinye ọlaedo niile sitere nʼaja mfufe ahụ nke ndị mmadụ wetara maka ịrụ ebe nsọ ahụ, bụ otu puku na narị kilogram ise. 25Ịdị arọ nke ọlaọcha enwetara nʼaka ọgbakọ ahụ, bụ puku kilogram anọ, na narị kilogram isii na iri ise dịka shekel ebe nsọ si dị. 26Ha niile tụrụ otu beka, otu isi, dịka ụtụ mgbe e kere ụtụ ọkara shekel dịka ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị, e nyere nʼisi onye ọbụla nke gabigara nʼebe ndị a gụrụ ọnụ nọ, bụ ndị gbara iri afọ abụọ rigoo. Ọnụọgụgụ ha dị narị isii, na puku atọ, na narị ise, na iri ise.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.