Native Bible

Exodus 37:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O jikwa osisi akashia ahụ mee okporo osisi, machiekwa ha ọlaedo.

Exodus 37:4 in English

Exodus 37:4 · Berean Standard Bible

Then he made poles of acacia wood and overlaid them with gold.

Context

2O ji ọlaedo a nụchara anụcha machie nʼime na azụ ya, jirikwa ọlaedo kpụọ ihe gburugburu akụkụ ya niile. 3Ọ kpụrụ mgbaaka ọlaedo anọ maka ya, kwụnyekwa ha nʼụkwụ anọ ya, ya bụ mgbaaka abụọ nʼotu akụkụ, mgbaaka abụọ nʼakụkụ nke ọzọ ya. 4O jikwa osisi akashia ahụ mee okporo osisi, machiekwa ha ọlaedo. 5O tinyekwara mkpara ndị ahụ nʼime mgbaaka ahụ dị nʼakụkụ igbe ahụ; ka ọ bụrụ ihe iji na-ebu ya. 6Emesịa, o ji ọlaedo a nụchara anụcha mee ihe e ji ekwuchi igbe ahụ. Aha a na-akpọ okwuchi igbe a bụ Oche Ebere. Ịdị ogologo ya dị otu mita na sentimita iri, obosara ya dị iri sentimita asaa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.