Native Bible

Exodus 37:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna. Ha kpụrụ ụkwụ ala ala ya, na alaka ya, mekwaa ka iko ya niile yiri okoko osisi, nʼisi ya niile, na ifuru ya niile bụrụ otu ya na ahụ ya.

Exodus 37:17 in English

Exodus 37:17 · Berean Standard Bible

Then he made the lampstand out of pure hammered gold, all of one piece: its base and shaft, its cups, and its buds and petals.

Context

15O jikwa osisi akashia mee okporo osisi ahụ e ji ebu tebul ahụ. Jirikwa ọlaedo machie ya. 16O mekwara ihe niile na-adị nʼelu tebul ahụ: efere, ngaji, ọkwa na iko, nke e ji awụpụ aja ihe ọṅụṅụ. Ọ bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka o ji kpụọ ha. 17Ha ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna. Ha kpụrụ ụkwụ ala ala ya, na alaka ya, mekwaa ka iko ya niile yiri okoko osisi, nʼisi ya niile, na ifuru ya niile bụrụ otu ya na ahụ ya. 18Alaka isii sitere nʼakụkụ abụọ nke ihe ịdọkwasị oriọna ahụ wapụta, alaka atọ nʼotu akụkụ ya, alaka atọ nʼakụkụ nke ọzọ. 19Iko atọ e mere dịka okoko osisi alụmọnd ya na ifuru, ya na okoko ya niile dịkwa nʼotu alaka; iko atọ nʼalaka nke ọzọ, otu a ka ọ ga-adị nʼalaka isii niile ahụ na-awapụta site nʼihe ịdọkwasị oriọna ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.