Native Bible

Exodus 37:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka e ji machie ya. A kpụnyekwara ihe ọkpụkpụ ọlaedo gburugburu ọnụ ọnụ ya.

Exodus 37:11 in English

Exodus 37:11 · Berean Standard Bible

He overlaid it with pure gold and made a gold molding around it.

Context

9Cherubim ndị a gbasara nku ha laa elu, were ha na-ekpuchi okwuchi ahụ. Cherubim ndị ahụ cherịtara onwe ha ihu, na-ele anya nʼebe okwuchi ahụ dị. 10Emesịa, o mere tebul nke ịdị ogologo ya bụ iri sentimita itoolu. Obosara ya bụ iri sentimita ise, ịla elu ya bụ iri sentimita asaa. Ọ bụ osisi akashia ka o ji mee ya. 11Ọ bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka e ji machie ya. A kpụnyekwara ihe ọkpụkpụ ọlaedo gburugburu ọnụ ọnụ ya. 12A rụnyere ihe nʼọnụ ọnụ tebul ahụ nke ịla elu ya ga-eru sentimita asatọ. Ihe a dị gburugburu ọnụ ọnụ tebul ahụ, ọ bụkwa ọlaedo a kpụrụ akpụ ka e ji rụọ ya. 13Ha kpụrụ mgbaaka ọlaedo anọ maka tebul ahụ; kwụnyekwa ha nʼakụkụ anọ ahụ nʼebe ụkwụ anọ ya dị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.