Native Bible

Exodus 36:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị niile mara ǹka nʼetiti ndị ọrụ ahụ ji ezi ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie wuo ụlọ nzute ahụ. Onye ọka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ha.

Exodus 36:8 in English

Exodus 36:8 · Berean Standard Bible

All the skilled craftsmen among the workmen made the ten curtains for the tabernacle. They were made of finely spun linen, as well as blue, purple, and scarlet yarn, with cherubim skillfully worked into them.

Context

6Mgbe ahụ, Mosis nyere iwu, ha zisara ozi ahụ nʼọmụma ụlọ ikwu niile sị, “Ka nwoke maọbụ nwanyị ọbụla gharakwa inwe ihe ọbụla nke ọ ga-eweta dịka onyinye maka ọrụ ebe nsọ a.” Nʼihi nke a, ndị mmadụ kwụsịrị iweta ihe ọzọ. 7Nʼihi na onyinye e wetara adịla ukwuu karịa ihe a chọrọ maka ọrụ ahụ. 8Ndị niile mara ǹka nʼetiti ndị ọrụ ahụ ji ezi ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie wuo ụlọ nzute ahụ. Onye ọka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ha. 9Akwa mgbochi ndị a ha nʼotu. Ịdị ogologo ha nʼotu nʼotu bụ mita iri na abụọ na ọkara. Obosara ha bụ otu mita na sentimita asatọ. 10E jikọtara akwa mgbochi ise nʼotu, jikọtakwa akwa ise nke ọzọ nʼotu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.