Native Bible

Exodus 36:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha ji ọlaedo machie mbudo ibo ndị ahụ niile. Kpụkwaa mgbaaka ọlaedo ka ọ bụrụ ọnọdụ ịchịkọta mkpọrọ osisi ahụ niile. Ha ji ọlaedo machiekwa mkpọrọ osisi ndị ahụ niile.

Exodus 36:34 in English

Exodus 36:34 · Berean Standard Bible

And he overlaid the frames with gold and made gold rings to hold the crossbars. He also overlaid the crossbars with gold.

Context

32ise nke ọzọ maka ndị dị nʼakụkụ nke ọzọ, ise nke ọzọ maka mbudo ibo dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, nʼebe ndịda ndịda nke ụlọ nzute ahụ 33Ha mere osisi ntụbichi nke dị nʼetiti ka ọ gabiga site nʼotu isi ruo nʼisi nke ọzọ nke mbudo ibo ahụ. 34Ha ji ọlaedo machie mbudo ibo ndị ahụ niile. Kpụkwaa mgbaaka ọlaedo ka ọ bụrụ ọnọdụ ịchịkọta mkpọrọ osisi ahụ niile. Ha ji ọlaedo machiekwa mkpọrọ osisi ndị ahụ niile. 35Ha ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee akwa mgbochi. Onye ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ya. 36Ha mere ogidi osisi akashia anọ maka ya were ọlaedo machie ha. Ha meere ha anya nko; wukwara ha ụkwụ ọlaọcha anọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.