Ọpụpụ 36:31
Exodus 36:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ji osisi akashia mekwaa osisi ntụbichi, ise maka mbudo ibo ndị dị nʼotu akụkụ nke ụlọ nzute ahụ,
Exodus 36:31 in English
Exodus 36:31 · Berean Standard Bible
He also made five crossbars of acacia wood for the frames on one side of the tabernacle,
Context
29Nʼisi nkuku abụọ ndị a, mbudo ibo ndị a nọ iche iche site nʼokpuru ruo nʼelu ya; ma e jikọrọ ha ọnụ nʼime otu mgbaaka. Emere ka ha abụọ yie ibe ya. 30Ha niile dị mbudo ibo asatọ na ụkwụ ọlaọcha dị iri na isii, ya bụ ụkwụ abụọ nʼokpuru mbudo ibo ọbụla. 31Ha ji osisi akashia mekwaa osisi ntụbichi, ise maka mbudo ibo ndị dị nʼotu akụkụ nke ụlọ nzute ahụ, 32ise nke ọzọ maka ndị dị nʼakụkụ nke ọzọ, ise nke ọzọ maka mbudo ibo dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, nʼebe ndịda ndịda nke ụlọ nzute ahụ 33Ha mere osisi ntụbichi nke dị nʼetiti ka ọ gabiga site nʼotu isi ruo nʼisi nke ọzọ nke mbudo ibo ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.