Ọpụpụ 36:3
Exodus 36:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha si nʼaka Mosis nara onyinye ndị ahụ niile ụmụ Izrel wetara maka ịrụ ọrụ ebe nsọ ahụ. Ndị mmadụ nọkwa na-eweta onyinye afọ ofufu ha ụtụtụ niile.
Exodus 36:3 in English
Exodus 36:3 · Berean Standard Bible
They received from Moses all the contributions that the Israelites had brought to carry out the service of constructing the sanctuary. Meanwhile, the people continued to bring freewill offerings morning after morning,
Context
1Ya mere, Bezalel na Oholiab na ndị ǹka niile Onyenwe anyị nyere ike na nghọta ịmata otu ha ga-esi rụọ ọrụ iwu ebe nsọ ahụ ga-arụ ọrụ ahụ dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu. 2Mgbe ahụ, Mosis kpọrọ Bezalel na Oholiab na ndị ǹka ndị ahụ Onyenwe anyị nyere ike na nghọta, ndị wepụtara obi ha ịbịa ịrụ ọrụ ahụ. 3Ha si nʼaka Mosis nara onyinye ndị ahụ niile ụmụ Izrel wetara maka ịrụ ọrụ ebe nsọ ahụ. Ndị mmadụ nọkwa na-eweta onyinye afọ ofufu ha ụtụtụ niile. 4Nʼihi ya, ndị ọrụ ǹka niile nọ na-arụ ọrụ nʼebe nsọ ahụ hapụrụ ọrụ ha na-arụ, 5bịakwute Mosis, sị ya, “Lee, onyinye ndị mmadụ na-eweta adịla ukwuu karịa ihe a chọrọ maka ịrụ ọrụ a Onyenwe anyị nyere nʼiwu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.