Native Bible

Exodus 35:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O mejupụtala na Mmụọ nke Chineke, nʼamamihe, nghọta na ihe ọmụma na ike ije ozi ọrụ ǹka dị iche iche.

Exodus 35:31 in English

Exodus 35:31 · Berean Standard Bible

And He has filled him with the Spirit of God, with skill, ability, and knowledge in all kinds of craftsmanship,

Context

29Nʼụzọ dị otu a ka ụmụ Izrel niile, ma nwoke ma nwanyị, ndị chọrọ inyeaka nʼọrụ ahụ Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu si weta onyinye ha. Onye ọbụla nʼime ha nyere Onyenwe anyị onyinye afọ ofufu. 30Mgbe ahụ, Mosis gwara ndị Izrel, sị, “Lee, Onyenwe anyị ahọpụtala Bezalel, nwa Uri, nwa Hua, onye si nʼebo Juda. 31O mejupụtala na Mmụọ nke Chineke, nʼamamihe, nghọta na ihe ọmụma na ike ije ozi ọrụ ǹka dị iche iche. 32Ichepụta ihe ǹka dị iche iche, nke metụtara ọlaọcha na ọlaedo na bronz, 33ịwa nkume na ido nkume, ịkwa ǹka osisi nakwa ọrụ ǹka niile dị iche iche.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.