Ọpụpụ 34:30
Exodus 34:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi mgbuke ahụ ihu Mosis na-egbuke, ụjọ ekweghị Erọn na ụmụ Izrel bịaruo ya nso.
Exodus 34:30 in English
Exodus 34:30 · Berean Standard Bible
Aaron and all the Israelites looked at Moses, and behold, his face was radiant. And they were afraid to approach him.
Context
28Mosis na Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. Ma nʼoge ndị a niile o righị nri ọbụla. Ọ ṅụkwaghị ihe ọṅụṅụ ọbụla. O dere na mbadamba nkume abụọ ahụ okwu niile nke ọgbụgba ndụ ahụ, nke bụ iwu iri ahụ. 29Mgbe Mosis ji mbadamba nkume abụọ nke ihe ama ahụ na-arịdata site nʼelu ugwu ahụ, ọ mataghị na ihu ya na-egbuke egbuke, nʼihi ọnọdụ nke ọ nọrọ nʼihu Onyenwe anyị. 30Nʼihi mgbuke ahụ ihu Mosis na-egbuke, ụjọ ekweghị Erọn na ụmụ Izrel bịaruo ya nso. 31Ma Mosis kpọrọ ha ka ha bịakwute ya. Nʼihi ya, Erọn na ndị ndu nzukọ Izrel bịara ka ha na Mosis kparịtaa ụka. 32Mgbe e mesịrị, ndị Izrel niile bịakwutere ya. O nyekwara ha iwu ndị ahụ Onyenwe anyị nyere ya nʼelu ugwu Saịnaị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.