Native Bible

Exodus 34:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye ọbụla esokwala gị, ma ọ bụkwanụ nọdụ nso ugwu ahụ. Ekwekwala ka igwe ehi maọbụ igwe atụrụ kpaa nri nso nso ugwu ahụ.”

Exodus 34:3 in English

Exodus 34:3 · Berean Standard Bible

No one may go up with you; in fact, no one may be seen anywhere on the mountain—not even the flocks or herds may graze in front of the mountain.”

Context

1Onyenwe anyị gwara Mosis, “Wapụta mbadamba nkume abụọ dịka nke mbụ, aga m edekwasị nʼelu ha okwu niile nke dị nʼelu mbadamba nkume ndị mbụ ahụ, bụ nke ị tụpịasịrị. 2Jikere nʼụtụtụ, rigoro ugwu Saịnaị ka i chee onwe gị nʼihu m nʼelu ugwu ahụ. 3Onye ọbụla esokwala gị, ma ọ bụkwanụ nọdụ nso ugwu ahụ. Ekwekwala ka igwe ehi maọbụ igwe atụrụ kpaa nri nso nso ugwu ahụ.” 4Mosis biliri nʼisi ụtụtụ, waa mbadamba nkume abụọ dịka ndị nke mbụ, rigoro ugwu Saịnaị dịka Onyenwe anyị gwara ya. Ọ jikwa nkume abụọ ahụ nʼaka ya. 5Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị rịdatara nʼime ogidi igwe ojii, guzo nʼihu Mosis, kwupụta aha ya bụ Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.