Native Bible

Exodus 34:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ugboro atọ nʼafọ ka ndị ikom unu niile ga-abịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nke Izrel.

Exodus 34:23 in English

Exodus 34:23 · Berean Standard Bible

Three times a year all your males are to appear before the Lord GOD, the God of Israel.

Context

21“Nʼoge ịkụ ihe nʼubi na nʼoge owuwe ihe ubi, rụọnụ ọrụ naanị ụbọchị isii. Zukwanụ ike nʼụbọchị nke asaa. 22“Mee Mmemme Izu Ụka asaa, bụ nke ị ga-eji mkpụrụ mbụ nke ọka wiiti mee, na Mmemme Nchịkọta Ihe nʼọgwụgwụ afọ ọbụla. 23Ugboro atọ nʼafọ ka ndị ikom unu niile ga-abịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nke Izrel. 24Nʼihi na aga m esite nʼihu unu chụpụ mba dị iche iche. Meekwa ka ala unu saa mbara. Ọ dịghị onye ọbụla ga-enwe anya ukwu nʼebe ala unu dị, mgbe unu na-aga iche onwe unu nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, ugbo atọ nʼafọ. 25“Unu etinyekwala ihe ọbụla nke nwere ihe na-eko achịcha nʼime ya, mgbe unu na-achụ ọbara nke aja nye m. Unu ahapụkwala aja sitere na Mmemme Ngabiga ka ọ nọọ ruo ụtụtụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.