Ọpụpụ 34:14
Exodus 34:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu efela chi ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị, onye aha ya bụ Ekworo, bụ Chineke na-ekwo ekworo.
Exodus 34:14 in English
Exodus 34:14 · Berean Standard Bible
For you must not worship any other god, for the LORD, whose name is Jealous, is a jealous God.
Context
12Kpacharanụ anya ka unu na ndị bi nʼala ahụ unu na-aba nʼime ya ghara ịgba ndụ. Ka ha ghara ị bụ ihe ịma nʼọnya nʼetiti unu. 13Kama, tikpọọnụ ebe ịchụ aja ha niile. Kụrienụ ogidi arụsị ha niile. Gbutukwaanụ osisi Ashera ha jiri mere chi ha. 14Unu efela chi ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị, onye aha ya bụ Ekworo, bụ Chineke na-ekwo ekworo. 15“Kpacharanụ anya ka unu na ndị bi nʼala ahụ ghara ịgba ndụ, nʼihi na mgbe ha na-akwaso chi ha iko, na-achụkwa aja nye chi ha, ha ga-akpọ unu oku nri, mgbe ahụ, unu ga-eri site nʼihe aja ha. 16Mgbe unu lụtara ụfọdụ ndị inyom ha dịka nwunye nye ụmụ unu ndị ikom, ndị inyom ndị a na-akwaso chi ha iko, ga-eme ka ụmụ unu ndị ikom soro ha nʼomume dị otu a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.