Native Bible

Exodus 33:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ọbụla Mosis na-aga nʼụlọ ikwu nzute ahụ, ndị Izrel niile na-apụta guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ha, na-ele ya anya tutu Mosis abanye nʼụlọ ikwu ahụ.

Exodus 33:8 in English

Exodus 33:8 · Berean Standard Bible

Then, whenever Moses went out to the tent, all the people would stand at the entrances to their own tents and watch Moses until he entered the tent.

Context

6Ya mere, ndị Izrel yipụrụ ihe ịchọ mma ha niile. Nʼugwu Horeb ka ha nọ mgbe ihe ndị a mere. 7Nʼoge a, Mosis na-ewere ụlọ ikwu manye nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu, ọ na-akpọ ya ụlọ nzute. Ọ na-amanye ya nʼebe dị anya site nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha. Onye ọ bụla nke chọrọ ịjụta Onyenwe anyị ase, na-apụ, gaa nʼụlọ nzute ahụ nke dị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu. 8Mgbe ọbụla Mosis na-aga nʼụlọ ikwu nzute ahụ, ndị Izrel niile na-apụta guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ha, na-ele ya anya tutu Mosis abanye nʼụlọ ikwu ahụ. 9Mgbe ọ banyere nʼụlọ ikwu ahụ; ogidi igwe ojii ahụ na-abịa guzochie nʼọnụ ụzọ mgbe Onyenwe anyị na Mosis na-akparị ụka. 10Nʼoge ọbụla, ndị mmadụ hụrụ ogidi igwe ojii ahụ ka o guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu nzute ahụ, ha onwe ha na-eguzokwa, onye ọbụla, nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha, kpọọ isiala.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.