Native Bible

Exodus 33:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m ezipu Mmụọ ozi m ka ọ gaa nʼihu unu chụpụrụ unu ndị Kenan, na ndị Amọrait, na ndị Het, na ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus.

Exodus 33:2 in English

Exodus 33:2 · Berean Standard Bible

And I will send an angel before you, and I will drive out the Canaanites, Amorites, Hittites, Perizzites, Hivites, and Jebusites.

Context

1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Duru ndị a i si nʼala Ijipt kpọpụta baa nʼala ahụ m kwere Ebraham, na Aịzik na Jekọb na nkwa, nʼihi na agwara m ha sị, ‘Aga m enye ụmụ ụmụ unu ala a, ka ọ bụrụ ihe nketa ha.’ 2Aga m ezipu Mmụọ ozi m ka ọ gaa nʼihu unu chụpụrụ unu ndị Kenan, na ndị Amọrait, na ndị Het, na ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus. 3Gbago nʼala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, ma agaghị m eso unu nʼije unu, nʼihi na unu bụ ndị isiike. Ọ bụrụ na m esoro unu, unu ga-anwa m ọnwụnwa, nke ga-eme ka m laa unu nʼiyi nʼụzọ.” 4Mgbe ndị mmadụ ahụ nụrụ okwu olu ike ndị a, ha malitere iru ụjụ, ọ dịghịkwa onye ọbụla yinyere ihe ịchọ mma ya nʼahụ ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.